Psalms 61

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ.

Ekpere nke onye nọ na nsogbu

1Nụrụ akwa m, O Chineke,
gee ntị nʼekpere m.

2Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,
ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;
duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
3Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,
na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ. a

4Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,
ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela
5Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;
i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.

6Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,
mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
7Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.

8Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.
Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
Copyright information for IboBIU